Jeremiah 29:10-13

N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a. N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.
JEREMAIA 29:10-13