Jeremiah 17:7-10

Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya. Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru. Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya? Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.
JEREMAIA 17:7-10