Judges 6:11-40

Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian. Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà. Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian. Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i? Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam. Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke. Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka. Biko, esila n'ebe a pua, rue mb͕e m'gābiakute Gi, weputa onyinyem inata iru-ọma, dọba ya n'iru Gi. Ọ si, Mu onwem gānọdu rue mb͕e i gābiaghachi. Gideon we ba n'ulo, dozie nwa-ewu, na achicha ekoghi-eko nke ephah utu ọka: o tiyere anu ahu nime nkata, tiye kwa ofè n'ite, weputa ya nye ya n'okpuru osisi terebinth ahu, we weta ya nso. Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n'elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a. Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya. Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru. Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu. Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza. O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya: wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku. Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali. Ndikom obodo ahu we bilie n'isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n'elu ebe-ichu-àjà nke ewuru. Ha we sirita onwe-ha, Ònye mere ihe a? Ha we jua ajuju, chọ kwa, si, Gideon nwa Joash emewo ihe a. Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya. Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel. Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya. O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha. Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo, le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n'ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n'ala nile buruburu, m'gāmara kwa na I gēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo. O we di otú a: o we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n'aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri. Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m'kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m'were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n'ala nile buruburu. Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.
NDI-IKPE 6:11-40