Jakobus 5:13-16

Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere. Ọ̀ di onye ọ bula nwere obi-utọ? ya bùa abù ọma. Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti unu nke aru-ya nādighi ike? ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n'isi-ya, nēte ya manu olive n'aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādighi ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie; ọ buru kwa na o mehieworo, agāb͕aghara ya nmehie ahu. Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.
JEMES 5:13-16