Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi. Unu nāriọ, ma unu adighi-anata ihe, n'ihi na unu nāriọ n'obi ọjọ, ka unu we mefu ya n'ihe-utọ nile unu.