JAKOBUS 1:22-25

Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu. N'ihi na asi na onye ọ bula bu onye nānu okwu ahu, ma ọ bughi onye nēme ya, onye ahu yiri nwoke nke nēkiri iru-ya n'enyo, bú iru o nwere mb͕e amuputara ya: n'ihi na o kiriri onwe-ya, ọ puwo kwa, ngwa ngwa o we chezọ aha madu ọ bu. Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.
JEMES 1:22-25