Isaiah 55:1-3

Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnweghi ego; bianu, zuru ọka, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējighi ego nārùghi ọnu-ahia. N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ. Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.
AISAIA 55:1-3