Isaiah 53:3-5

Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe. N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala. Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike.
AISAIA 53:3-5