Ma, ndi m'huru n'anya, emewo ka ayi kwere ihe ka nma bayere unu, bú ihe nke ha na nzọputa yikọ kwa, ọ bu ezie na ayi nēkwu otú a: n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.