Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli. Ya mere ayi were obi-ike si,
Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka;
Gini ka madu gēmem?