Hebrews 11:23-26

Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu. Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero; n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge; ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu.
NDI-HIBRU 11:23-26