Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya. N'ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà. Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya.