Ephesians 5:13-21

Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ; nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist.
NDI EFESỌS 5:13-21