Ecclesiastes 4:9-12

Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu. N'ihi na ọ buru na ha ada, otù nime ha gēme ka ibe-ya bilie: ma ahuhu gādiri onye ahu nke nání ya di mb͕e ọ nāda, ọ dighi kwa onye abua o nwere ime ka o bilie. Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku? Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.
EKLISIASTIS 4:9-12