Colossians 3:22-24

Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist.
NDI KỌLỌSI 3:22-24