COLOSENSES 3:12-17

Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi; nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele. Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke. Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya.
NDI KỌLỌSI 3:12-17