2 Corinthians 5:6-10

Ya mere ayi nēnwe obi-ike mb͕e nile, mata kwa na mb͕e ayi nọ n'ulo n'aru-ayi, ayi anọghi n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: (n'ihi na ayi sitere n'okwukwe nējeghari, ọ bughi n'ọhuhu-uzọ); ayi nēnwe obi-ike, ka m'kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n'ulo n'aru-ayi, ka ayi nọ kwa n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ. N'ihi nka ayi nējisi kwa ike ka ayi we buru ndi di Ya ezi utọ, ma ayi nọ n'ulo ma-ọbu na ayi anọghi n'ulo. N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.
II. NDI KỌRINT 5:6-10