2 Corinteni 5:18-20

Ma ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n'aka Kraist me ka ayi na Ya onwe-ya di n'otù, O we nye ayi ije-ozi nke ime-ka-adi-n'otú ahu; nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu. Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.
II. NDI KỌRINT 5:18-20