Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Samuel 2:1-10

I. SAMUEL 2:1-10 - Hana we kpe ekpere, si:
Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova,
Mpim adiwo elu n'ime Jehova:
Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom,
N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.
Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;
N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:
Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.
Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;
Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:
N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,
Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.
Anyajiwo uta ndi-dike,
Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.
Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;
Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:
Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;
Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.
Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:
Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.
Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:
Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.
Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,
Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,
Ime ka ha na ndi-isi nọdu,
Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:
N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,
O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.
Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,
Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri;
N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.
Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu;
Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe:
Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe;
Ọ gēnye kwa eze-Ya ike,
Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi. Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova; N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi: Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi. Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu; Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta: N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu, Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume. Anyajiwo uta ndi-dike, Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké. Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri; Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu: Ebe nwanyi àgà muworo umu asa; Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru. Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu: Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota. Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya: Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu. Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu, Ime ka ha na ndi-isi nọdu, Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru: N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa, O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha. Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike. Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu; Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe: Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe; Ọ gēnye kwa eze-Ya ike, Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

I. SAMUEL 2:1-10