1 Peter 5:5-7

Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara. Ya mere wedanu onwe-unu n'okpuru aka di ike nke Chineke, ka O we welie unu elu n'oge nke Ya; nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.
I. PITA 5:5-7