I Peter 1:9-13

ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu. Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu: nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha. Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha. N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist
I. PITA 1:9-13