1 John 5:13-16

Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ, bú ndi kwere n'aha Ọkpara Chineke, ka unu we mata na unu nwere ndu ebighi-ebi. Nkwuwa-okwu ahu nke ayi nwere n'ebe Ọ nọ bu nka, na ọ buru na ayi ariọ ihe ọ bula dika ọchichọ-Ya si di, Ọ nānu olu-ayi: ọ buru kwa na ayi matara na Ọ nānu olu-ayi n'ihe ọ bula ayi nāriọ, ayi matara na ayi nwere ihe-aririọ ahu ayi riọ̀woro n'aka-Ya. Ọ buru na onye ọ bula ahú nwa-nna-ya ka ọ nēmehie nmehie nke nādighi-eweta ọnwu, ọ gāriọ aririọ, Chineke gēnye kwa ya ndu inye ndi nēmehie nmehie ahu nke nādighi-eweta ọnwu. Nmehie di nke nēweta ọnwu: ọ bughi ekpere bayere nka ka m'nāgwa ya ka o kpe.
I. JỌN 5:13-16