1 Corinthians 16:13-18

Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike. Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya. Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi), ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu. Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem. N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.
I. NDI KỌRINT 16:13-18