1 Corinthians 1:10-18

Ma, umu-nnam, esiterem n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist riọ unu, ka unu nile nēkwu otù ihe, ka nkewa ghara kwa idi n'etiti unu; kama ka eme unu ka unu zue okè n'otù uche ahu na n'otù ìzù ahu. N'ihi na ndi èzí-na-ulo Kloi gosirim ihe bayere unu, umu-nnam, na esem-okwu di n'etiti unu. Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist. Èkèwo Kraist èkè? ọ̀ gābu na akpọgidere Pọl n'obe n'ihi unu? mà-ọbu na emere unu baptism ibà n'aha Pọl? Anamekele Chineke na ọ dighi onye ọ bula n'etiti unu m'mere baptism, ma-ọbughi Krispọs na Gaiọs; ka onye ọ bula ghara isi na emere unu baptism ibà n'aha nkem. Ma eme-kwa-ram èzí-na-ulo Stefanas baptism: ma ewepu ndia, amataghm ma emerem onye ọ bula ọzọ baptism. N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu. N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.
I. NDI KỌRINT 1:10-18