1 Chronicles 29:11-12

Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi. Ma àkù ma nsọpuru nēsite n'ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di; n'aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike.
I. IHE EMERE 29:11-12