Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: Job 4

JOB 4:1 (IGBOB)

Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

JOB 4:2 (IGBOB)

Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi? Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?

JOB 4:3 (IGBOB)

Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti, I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.

JOB 4:4 (IGBOB)

Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.

JOB 4:5 (IGBOB)

Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.

JOB 4:6 (IGBOB)

Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi? Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?

JOB 4:7 (IGBOB)

Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ? Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?

JOB 4:8 (IGBOB)

Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi, Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.

JOB 4:9 (IGBOB)

Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.

JOB 4:10 (IGBOB)

Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja, Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.

JOB 4:11 (IGBOB)

Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara, Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.

JOB 4:12 (IGBOB)

Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye, Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.

JOB 4:13 (IGBOB)

N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu,

JOB 4:14 (IGBOB)

Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji, O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.

JOB 4:15 (IGBOB)

Otù mọ we gabiga n'irum; Aji anu-arum we guzo ọtọ.

JOB 4:16 (IGBOB)

Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya; Otù udi di n'iru anyam: Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si,

JOB 4:17 (IGBOB)

Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke? Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?

JOB 4:18 (IGBOB)

Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:

JOB 4:19 (IGBOB)

Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla.

JOB 4:20 (IGBOB)

Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.

JOB 4:21 (IGBOB)

Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha? Ha nānwu, ọ bughi kwa n'amam-ihe.

JOB 1:4 (IGBOB)

Ma umu-ya ndikom jere me ọṅuṅu-manya-vine n'ulo nwoke ọ bula nime ha n'ubọchi-ya; ha zì-kwa-ra kpọ umu-nne-ha ndinyom atọ iso ha rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

JOB 2:4 (IGBOB)

Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.

JOB 3:4 (IGBOB)

Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri; Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya, Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.

JOB 5:4 (IGBOB)

Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di, Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama, Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.