Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: Deuteronomy 6:4-9

DEUTERONOMI 1:1 (IGBOB)

Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab.

DEUTERONOMI 1:2 (IGBOB)

Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n'uzọ ugwu Sia.

DEUTERONOMI 1:3 (IGBOB)

O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di;

DEUTERONOMI 1:4 (IGBOB)

mb͕e o tib͕usiri Saihon, bú eze ndi-Amorait, nke bi na Heshbon, na Og, bú eze Beshan, nke bi n'Ashtarot, n'Edrei:

DEUTERONOMI 1:5 (IGBOB)

n'ofè Jọdan, n'ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si,

DEUTERONOMI 1:6 (IGBOB)

Jehova, bú Chineke-ayi, gwara ayi okwu na Horeb, si, O zuworo unu ibi n'ugwu a:

DEUTERONOMI 1:7 (IGBOB)

chenu iru, bulie ije, ba n'ugwu ndi-Amorait, ru kwa ab͕ata-ya nile, n'Araba, na n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na nime Negeb, na n'ọnu-miri nke oké osimiri, bú ala nke ndi Kenean, na Lebanon, rue Osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis.

DEUTERONOMI 1:8 (IGBOB)

Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.

DEUTERONOMI 1:9 (IGBOB)

M'we gwa unu okwu na mb͕e ahu, si, Apughm ibū unu náním:

DEUTERONOMI 1:10 (IGBOB)

Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta.

DEUTERONOMI 1:11 (IGBOB)

Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!

DEUTERONOMI 1:12 (IGBOB)

M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?

DEUTERONOMI 1:13 (IGBOB)

Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m'gēdo kwa ha ndi-isi-unu.

DEUTERONOMI 1:14 (IGBOB)

Unu we zam, si, Ihe nke i kwuworo di nma ime.

DEUTERONOMI 1:15 (IGBOB)

M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.

DEUTERONOMI 1:16 (IGBOB)

M'we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n'etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n'etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya.

DEUTERONOMI 1:17 (IGBOB)

Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya.

DEUTERONOMI 1:18 (IGBOB)

M'we nye unu n'iwu na mb͕e ahu ihe nile unu gēme.

DEUTERONOMI 1:19 (IGBOB)

Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n'uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea.

DEUTERONOMI 1:20 (IGBOB)

M'we si unu, Unu abiaruwo ugwu ndi-Amorait, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

DEUTERONOMI 1:21 (IGBOB)

Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n'iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

DEUTERONOMI 1:22 (IGBOB)

Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n'iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha.

DEUTERONOMI 1:23 (IGBOB)

Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo:

DEUTERONOMI 1:24 (IGBOB)

ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.

DEUTERONOMI 1:25 (IGBOB)

Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.