Ngosi ihe ndị a chọpụtara maka: 1 Chronicles 15
I. IHE EMERE 15:1 (IGBOB)
Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n'obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū.
I. IHE EMERE 15:2 (IGBOB)
Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.
I. IHE EMERE 15:3 (IGBOB)
Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.
I. IHE EMERE 15:4 (IGBOB)
Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai:
I. IHE EMERE 15:5 (IGBOB)
nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi:
I. IHE EMERE 15:6 (IGBOB)
nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù:
I. IHE EMERE 15:7 (IGBOB)
nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri:
I. IHE EMERE 15:8 (IGBOB)
nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri:
I. IHE EMERE 15:9 (IGBOB)
nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ:
I. IHE EMERE 15:10 (IGBOB)
nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.
I. IHE EMERE 15:11 (IGBOB)
Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,
I. IHE EMERE 15:12 (IGBOB)
si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya.
I. IHE EMERE 15:13 (IGBOB)
N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.
I. IHE EMERE 15:14 (IGBOB)
Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel.
I. IHE EMERE 15:15 (IGBOB)
Umu ndi Livai we were nkpa-n'aka-ya abua būru ib͕e Chineke n'ubu-ha n'elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di.
I. IHE EMERE 15:16 (IGBOB)
Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.
I. IHE EMERE 15:17 (IGBOB)
Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n'umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n'umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia;
I. IHE EMERE 15:18 (IGBOB)
tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.
I. IHE EMERE 15:19 (IGBOB)
Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;
I. IHE EMERE 15:20 (IGBOB)
na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ;
I. IHE EMERE 15:21 (IGBOB)
na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.
I. IHE EMERE 15:22 (IGBOB)
Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.
I. IHE EMERE 15:23 (IGBOB)
Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.
I. IHE EMERE 15:24 (IGBOB)
Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.
I. IHE EMERE 15:25 (IGBOB)
Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova: