Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 13:1-9

ZEKARAIA 13:1-9 Bible Nso (IGBOB)

N'ubọchi ahu isi-iyi gādi nke ghere oghe nye ulo Devid, nye kwa ndi bi na Jerusalem, bayere nmehie baye-kwa-ra ọrurú. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga. Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n'ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ: ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m'bu, onye-ọlu-ubi ka m'bu; n'ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m'di na nwata. Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n'etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n'ulo ndi nāhum n'anya. Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà. Ọ gēru kwa, n'ala nka nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya. M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.

ZEKARAIA 13:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile. “Nʼụbọchị ahụ, otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha ONYENWE ANYị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya. “Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’ “Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m, na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,” otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ ga-agbasasịkwa. Aga m eweli aka m megide ndị dị nta. Nʼala ahụ niile,” otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya, “Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida, ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ. Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha, jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo. Ha ga-akpọku aha m, aga m azakwa ha. Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’ Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị.’ ”