Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ZEKARAIA 11:12-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ZEKARAIA 11:12-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ. ONYENWE ANYị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYị.

ZEKARAIA 11:12-13 IGBOB (Bible Nso)

M'we si ha, Ọ buru na ọ di nma n'anya-unu, nyenum ugwọ-ọlum; ma ọ dighi, gharanu. Ha we tùa ugwọ-ọlum, bú orú ego ọla-ọcha na iri. Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M'we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n'ulo Jehova.