ZEKARAIA 1:1-6
ZEKARAIA 1:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu ONYENWE ANYị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị, “ONYENWE ANYị were oke iwe megide nna unu ha. Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara. Olee ebe ka nna nna unu ha nọ ugbu a? Ndị amụma ahụ, ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”
ZEKARAIA 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)
N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si, Jehova ewesawo nna-unu-hà oké iwe. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Laghachikutenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri. Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Nna-unu-hà, òle ebe ha nọ? ndi-amuma kwa, ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ha nādi ndu? Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.