TAITỌS 1:1-4
TAITỌS 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Akwụkwọ ozi a si nʼaka m, Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye ahọpụtara ime ka okwukwe ndị Chineke, na nghọta banyere ịmara eziokwu ahụ na-eduba na ndụ ịsọpụrụ Chineke gaa nʼihu, nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge. Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu. Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ.
TAITỌS 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Pọl, orù nke Chineke, na onye-ozi nke Jisus Kraist, dika okwukwe ndi Chineke rọputara si di, ya na nmazu nke ezi-okwu ahu nke di n'uzọ nsọpuru-Chineke, n'olile-anya nke ndu ebighi-ebi, nke Chineke, Onye nāpughi ikwu okwu-ugha, kwere nkwa ya tutu mb͕e ebighi-ebi erue; ma O mere ka okwu-Ya puta ìhè n'oge nke aka Ya nime nkwusa, nke enyere n'aka mu onwem na ntukwasi-obi idebe dika ihe nke Onye-nzọputa-ayi Chineke nyere n'iwu si di; Pọl nka nēdegara Taitọs akwukwọ, bú ezi nwa nkem dika okwukwe ayi kwekọrọ si di: Amara na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nzọputa-ayi puta.