RUT 4:13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
RUT 4:13 IGBOB (Bible Nso)
Boaz we kuru Rut, o we ghọrọ ya nwunye; o we bakuru ya, Jehova we me ka ọ turu ime, ọ mua nwa-nwoke.
RUT 4:13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Boaz kpọọrọ Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe ya na Rut dinakọrọ, ONYENWE ANYị nyeere ya aka ịtụrụ ime. Ọ mụkwara nwa nwoke.