Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 8:16-21 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI ROM 8:16-21 IGBOB (Bible Nso)

Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke: ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto. N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke.

NDI ROM 8:16-21 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya. Nʼikwu eziokwu, ahụhụ niile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ebube niile a ga-ekpughe nʼime anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. Nʼihi na e tinyere ihe e kere eke nʼọnọdụ ihe na-abaghị uru, ma ọ bụghị site nʼọchịchọ nke onwe ya, kama nʼọchịchọ nke onye ahụ tinyere ya nʼọnọdụ ahụ nʼime olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site nʼagbụ nke ire ure, sorokwa keta oke nʼebube ahụ ga-abụ nke ụmụ Chineke.