NDI ROM 7:21-23 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 7:21-23 IGBOB (Bible Nso)
Ya mere ahurum iwu a, na ihe ọjọ dim nso n'ebe akam gēru, mu, bú onye nāchọ ime ihe ọma. N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di: ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru.
NDI ROM 7:21-23 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.