NDI ROM 7:16-17 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 7:16-17 IGBOB (Bible Nso)
Ma ọ buru na ihe m'nāchọghi, ihe ahu ka m'nēme, anamekweye iwu ahu na ọ bu ihe ọma. Ma ub͕u a ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.
NDI ROM 7:16-17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma. Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m.