Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 7:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI ROM 7:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Ma-ọbu ùnu amaghi, umu-nnam (n'ihi na anamagwa ndi mara iwu okwu), na iwu bu onye-nwe madu ka oge ra ọ nādi ndu? N'ihi na iwu kekọrọ nwanyi nke nwere di n'aru di-ya mb͕e di-ya nọ na ndu; ma ọ buru na di-ya nwuru, atọpuwo ya n'iwu nke di-ya. Ya mere otú a, agākpọ ya nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche mb͕e di-ya nọ na ndu: ma ọ buru na di-ya nwuru, ọ puwo n'iwu nwere onwe-ya, nke nēme ya ka ọ ghara ibu nwanyi nākwa iko, ma ọ buru na ọ lakuru nwoke di iche. Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.

NDI ROM 7:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọ bụ na unu amaghị ụmụnna m, unu ndị maara iwu nke ọma na ọ bụ oge mmadụ dị ndụ ka iwu na-ejide ya? Dịka ihe ịmaatụ, iwu na-ejikọta nwanyị lụrụ di na di ya mgbe di ya ka nọ ndụ, ma ọ bụrụ na di nwanyị ahụ anwụọ, ọ nọkwaghị nʼokpuru iwu jikọtara ha dịka di na nwunye. A ga-akpọ ya nwanyị na-akwa iko ma ọ bụrụ na ọ lakwuru nwoke ọzọ mgbe di ya ka dị ndụ. Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya site nʼiwu ahụ. Ọ kwaghị iko ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwoke ọzọ. Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.