NDI ROM 6:3-6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 6:3-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ. Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
NDI ROM 6:3-6 IGBOB (Bible Nso)
Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n'ọnwu-Ya? Ya mere esitere na baptism-ayi likọ ayi na Ya ibà n'ọnwu ahu: ka, dika esitere n'ebube nke Nna-Ya me ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi onwe-ayi we jeghari kwa na ndu ọhu otú a. N'ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n'ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe; ebe ayi mara nka, na akpọgidekọrọ Ya na madu ochie ayi n'obe, ka ewe me ka aru-ayi nke nmehie nwezu ghara idi irè, ka ayi we ghara idi nābu orù nke nmehie ọzọ