NDI ROM 4:18-22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 4:18-22 IGBOB (Bible Nso)
Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi. O we tugharia uche n'aru nke onwe-ya nke nwuwori, (ebe ọ b͕ara ihe di ka ọgu arọ ise), tughari kwa uche n'àkpà-nwa Sera na ọ bu ihe nwuru anwu, ma emeghi ya ka ọ ghara idi ike n'okwukwe-ya: o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto, nēkwezu kwa na ihe O kwereri na nkwa, Ọ puru ime kwa. N'ihi ya agu-kwa-ra ya nye ya dika ezi omume.
NDI ROM 4:18-22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.