Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

NDI ROM 4:1-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI ROM 4:1-3 IGBOB (Bible Nso)

Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di? N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ. N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume.

Kekọrịta
NDI ROM 4 IGBOB

NDI ROM 4:1-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.”

Kekọrịta
NDI ROM 4 BIU