Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 4:1-12,16

NDI ROM 4:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.” Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ. Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya. “Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile. Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.” Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu. Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.

NDI ROM 4:1-12 Bible Nso (IGBOB)

Gini kwa ka ayi gēkwu na Abraham huworo, bú nna-ayi ochie dika anu-aru si di? N'ihi na asi na aguru Abraham n'onye ezi omume site n'ọlu, o nwere ihe inya isi; ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ. N'ihi na ọ̀ bu gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Abraham we kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya dika ezi omume. Ma onye nālu ọlu, agughi ugwọ-ọlu-ya nye ya dika amara, kama dika ugwọ. Ma onye nālughi ọlu, kama ọ kwere n'Onye ahu Nke nāgu onye nāsọpughi Chineke n'onye ezi omume, anāgu okwukwe-ya nye ya dika ezi omume. Ọbuná dika Devid nāsi kwa na madu ahu bu onye ngọzi diri, bú onye Chineke nāgu ezi omume nye ya mb͕e ọ kālughi ọlu, si, Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha, Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha. Ngọzi nādiri nwoke ahu onye Onye-nwe-ayi nāgaghi-agu nmehie nye ya. Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume. Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù: ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha; ka o we buru kwa nna nke obibì-úgwù n'ebe ndi ahu nọ, bú ndi nābughi nání ndi sitere n'obibì-úgwù, kama ha nēsozi kwa ije-ukwu nke okwukwe ahu nke nna-ayi Abraham, nke o nwere n'ebìghi-úgwù.