NDI ROM 3:10-18
NDI ROM 3:10-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Dịka e dere ya, “Ọ dịghị onye ọbụla bụ onye ezi omume, ọ dịghị ọ bụladị otu onye. Ọ dịghị onye ọbụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ ịchọ Chineke. Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile, ọ dịghị onye bara uru nʼime ha. Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma, a pụghị ịchọta ọ bụladị otu onye. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Ọnụ ha jupụtara nʼokwu na-akụ ilu na ọbụbụ ọnụ. Ụkwụ ha na-eme ọsịịsọ ịkwafu ọbara. Mbibi na nhụju anya dị nʼụzọ ha niile. Ha amaghị ihe bụ ụzọ udo. Ha amatabeghị ihe ịtụ egwu Chineke pụtara.”
NDI ROM 3:10-18 Bible Nso (IGBOB)
dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli; Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke; Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha: Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu: Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara; Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha; Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa: Egwù Chineke adighi n'anya-ha.