NDI ROM 15:1-3
NDI ROM 15:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”
Kesaa
Gụọ NDI ROM 15NDI ROM 15:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ. Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo. N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.
Kesaa
Gụọ NDI ROM 15