NDI ROM 14:13-23 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 14:13-23 IGBOB (Bible Nso)
Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya. Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú. N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya. Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu: n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ. N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu. Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo. Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya. Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya. Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa. Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.
NDI ROM 14:13-23 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ. Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha. Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ. Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe. Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ. Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya. Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu. Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ. Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ. Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara. Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie.