NDI ROM 14:1-6
NDI ROM 14:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike. Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya. Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele.
NDI ROM 14:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi. Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi. Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya. Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo. Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya. Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke.