Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI ROM 14:1-12

NDI ROM 14:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike. Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya. Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele. Nʼihi na o nweghị onye nʼime anyị na-adịrị naanị onwe ya ndụ, o nwekwaghị onye nʼime anyị na-anwụrụ naanị onwe ya ọnwụ. Ọ bụrụ na anyị adịrị ndụ, anyị dị ndụ nye Onyenwe anyị; ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị nwụrụ nye Onyenwe anyị; ya mere ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, ma biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ. Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke. E dere ya, “ ‘Nʼezie, dịka m na-adị ndụ,’ ka Onyenwe anyị kwuru, ‘ikpere niile ga-egbu nʼihu m; ire niile ga-ekwupụtakwa Chineke.’ ” E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.

NDI ROM 14:1-12 Bible Nso (IGBOB)

Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi. Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi. Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya. Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo. Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya. Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula n'etiti ayi nke di ndu n'ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n'ebe ya onwe-ya nọ. N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi. N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu. Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke. Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.