NDI ROM 11:17 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 11:17 IGBOB (Bible Nso)
Ma ọ buru na anyakapuru alaka ufọdu, ma gi onwe-gi, ọ bu ezie na i bu osisi olive nke ọhia, ma anyakudoro gi n'etiti ha, i ghọ-kwa-ra onye gi na ha nēnwekọ nkpọrọgwu nke umi nke olive ahu
NDI ROM 11:17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, werekwa unu bụ alaka osisi oliv ọhịa nyapagide nʼọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola keta oke na ngọzị sitere na mgbọrọgwụ osisi oliv ahụ.