NDI ROM 11:1-10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI ROM 11:1-10 IGBOB (Bible Nso)
Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta. Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si, Onye-nwe-ayi, ha b͕uru ndi-amuma-Gi, ha gwudara ebe-ichu-àjà-Gi nile: nání mu onwem fọdu-kwa-ra, ha nāchọ kwa ndum. Ma gini ka ndum-ọdu Chineke nāgwa Ya? Arapurum nye Onwem nnù ndikom iri-na-asa na ọgu iri, madu ndi ọ dighi mb͕e ha b͕uru ikperè nye Beal. Ya mere otú a n'oge di ub͕u a ndi fọduru aputawo kwa dika nrọputa nke amara si di. Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a. Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Chineke nyere ha mọ nke oké ura, anya ighara ihu uzọ, na nti ighara inu ihe, rue ubọchi ta. Devid nāsi kwa, Ka table-ha ghọ ib͕udu, na ihe eji achu ha ntà, Na ọnyà, na ihe-nnyeghachi n'ebe ha nọ: Ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ, Gi me kwa ka azú-ha ruru mb͕e nile.
NDI ROM 11:1-10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta. Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel? “Onyenwe m, ha egbuchala ndị amụma gị niile, mebisiekwa ebe ịchụ aja gị niile, maọbụ naanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.” Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? “E nwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nʼanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal.” Otu a ka ọ dịkwa nʼoge dị ugbu a, a họrọla mmadụ ole na ole site nʼamara ya. Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu. Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha. Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.” Devid kwukwara, “Ka tebul ha ghọọrọ ha igbudu na ọnya, ha bụrụkwa ihe ịsọ ngọngọ na ntaramahụhụ nye ha. Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ. Mee ka azụ ha bụrụ ihe arọjiri arọji ruo mgbe ebighị ebi.”