NDI ROM 1:1-17 - Compare All Versions
NDI ROM 1:1-17 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya. Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ. Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ. Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị. Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya. Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst. Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile. Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m. Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu. Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị. Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu. Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom. Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik. Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”
NDI ROM 1:1-17 IGBOB (Bible Nso)
Pọl, orù nke Jisus Kraist, onye akpọrọ ibu onye-ozi, onye ekewapuru nye ozi ọma Chineke, nke O buru uzọ kwere na nkwa site n'ọnu ndi-amuma-Ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ, bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di, Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi, Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya: ndi unu onwe-unu nọ kwa n'etiti ha, ndi akpọrọ ibu ndi nke Jisus Kraist: Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia. Mbu, anamekele Chinekem ekele site na Jisus Kraist bayere unu nile, na anēkwusa okwukwe-unu n'uwa dum. N'ihi na Chineke, Onye m'nēkpere nime mọm n'ozi ọma nke Ọkpara-Ya, bu Onye-àmàm, otú m'nārapughi aka n'ihota unu, nāriọ aririọ mb͕e nile n'ekperem nile, ọ buru na, ma eleghi anya, ub͕u a n'oge a ezi uzọ gādirim ibiakute unu, n'ihe Chineke nāchọ. N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike; nke ahu bu, ka ewe kasie mu na unu obi n'etiti unu, site n'okwukwe ayi kwekọrọ, ma nke unu ma nke mu onwem. Ma achọghi m ka unu ghara imara, umu-nnam, na ọtutu mb͕e m'zubere ibiakute unu (eb͕ochi-kwa-ram ibia rue ub͕u a), ka m'we nwe kwa nkpuru ufọdu n'etiti unu, dika ọ di kwa n'etiti ndi mba ọzọ fọduru. Ejim madu nile ugwọ, ma ndi-Grik ma ndi nāsu asusu ọzọ, ma ndi mara ihe ma ndi nēnweghi uche. Otú a, ka ihe bayere mu onwem ra, ọ dim ọku n'obi izì kwa unu ndi bi na Rom ozi ọma. N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa. N'ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n'okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu.