Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NKPUGHE 21:1-8

NKPUGHE 21:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.” Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye. Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m. Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”